Psalms 15

Abụ Ọma Devid.

Onye ga-ebi nʼugwu nsọ Onyenwe anyị?

1 Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị?
Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?

2Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta,
onye na-arụ ọrụ ezi omume,
onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.
3Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ,
onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ,
na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,
4onye na-eleda onye ajọ omume anya,
ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,
onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere,
ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,
5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma,
onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha.

Onye na-eme ihe ndị a
agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.
Copyright information for IboBIU